26 N’oge ahụ, olu ya mere ka ụwa maa jijiji,+ ma o kwere nkwa ugbu a, sị: “M ka ga-eme ọzọ ka ụwa na eluigwe maa jijiji.”+ 27 Ma okwu bụ́ “m ka ga-eme ọzọ” na-egosi na a ga-ewepụ ihe ndị e mere ka ha maa jijiji, bụ́ ihe ndị Chineke na-ekeghị, ka ihe ndị a na-emeghị ka ha maa jijiji wee dịgide.