4 “Jehova kwuru, sị, ‘Ma ugbu a, Zerubabel, dị ike. Dịkwa ike, Joshụa nnukwu onye nchụàjà, nwa Jehozadak.’
“Jehova kwukwara, sị, ‘Dịkwanụ ike, unu niile ndị bi n’ala a,+ rụọkwanụ ọrụ.’
“‘N’ihi na m nọnyeere unu.’+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.