9 Mgbe ihe ndị a gachara, ka m nọ na-ele anya, ahụrụ m oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yi uwe mwụda na-acha ọcha,+ jirikwa igu nkwụ n’aka.+ Ha si ná mba niile na ebo niile na agbụrụ niile na asụsụ niile.+