7 Onye nchụàjà ahụ ga-eweretụ ọbara tee na mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà insens na-esi ísì ọma,+ nke dị n’ihu Jehova n’ụlọikwuu nzute. Ọ ga-awụsakwa ọbara niile fọrọ n’ọbara oké ehi ahụ n’ala ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ,+ nke dị n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute.