-
2 Pita 3:1, 2Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Ndị m hụrụ n’anya, akwụkwọ ozi a bụ nke abụọ m na-edetara unu. Achọrọ m ichetara unu ka unu gbaa mbọ na-eche echiche nke ọma otú m gwara unu n’akwụkwọ ozi nke mbụ.+ 2 M na-ede ihe a ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru n’oge gara aga na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị kụziri, nke ndịozi* kụziiri unu.
-