11 Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla gbara nwunye ya alụkwaghịm ma lụọ nwaanyị ọzọ, na-akwa iko,+ na-emejọkwa nwunye mbụ ya. 12 Ọ bụrụkwa na nwaanyị agbaa di ya alụkwaghịm ma lụrụ di ọzọ, ọ na-akwa iko.”+
3 N’ihi ya, mgbe di ya nọ ndụ, a ga-akpọ ya nwaanyị na-akwa iko ma ọ lụọ nwoke ọzọ.+ Ma ọ bụrụ na di ya anwụọ, iwu di ya ejighịzi ya. Ọ bụghị nwaanyị na-akwa iko ma ọ lụọ nwoke ọzọ.+