14 O wee họpụta mmadụ iri na abụọ, ndị ọ kpọkwara ndịozi. Ha ga na-eso ya. Ọ ga-ezipụ ha ka ha na-ekwusa ozi ọma, 15 ọ ga-enyekwa ha ikike ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ.+
9O wee kpọkọta ndịozi ya iri na abụọ, nye ha ikike ịgwọ ọrịa+ na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ niile.+2 O zipụkwara ha ka ha gaa kwusaa gbasara Alaeze Chineke ma gwọọ ọrịa.