5 Ndị Ninive wee nwee okwukwe na Chineke.+ Ha kwuziri ka onye ọ bụla n’ime ha buo ọnụ ma yiri ákwà iru uju, malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu. 6 Mgbe eze Ninive nụrụ ihe Jona na-ekwu, o biliri n’ocheeze ya, yipụ uwe eze ya, yiri ákwà iru uju ma nọdụ ala ná ntụ.