-
Mak 7:8-13Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 Unu na-ahapụ iwu Chineke ma na-eso ọdịnala ụmụ mmadụ.”+
9 Ọ gwakwara ha, sị: “Unu ji aghụghọ* na-eleghara iwu Chineke anya ka unu wee debe ọdịnala unu.+ 10 Dị ka ihe atụ, Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị.’+ Ọ sịkwara, ‘A ga-egbu onye kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi.’*+ 11 Ma unu na-asị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya ma ọ bụ nna ya: “Ihe ọ bụla m nwere nke m gaara eji nyere gị aka bụ kọban (ya bụ, onyinye m kwere Chineke ná nkwa),”’ 12 unu anaghịzi ekwe ka o meere nne ya ma ọ bụ nna ya otu mkpụrụ ihe.+ 13 Unu si otú a eji ọdịnala unu nke unu nyefere ndị ọzọ eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.+ Unu na-emekwa ọtụtụ ihe yiri ya.”+
-