-
1 Pita 2:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 N’ihi ya, ọ pụrụ iche n’anya unu maka na unu kweere na ya. Ma ọ pụghị iche n’anya ndị na-ekweghị na ya. Akwụkwọ Nsọ kwuru na “nkume ndị na-arụ ụlọ jụrụ+ aghọọla nkume ji ụlọ”+ 8 na “nkume na-akpọbi ha ụkwụ nakwa oké nkume na-akpasu ha iwe.”*+ Ha na-ada n’ihi na ha anaghị eme ihe okwu Chineke kwuru. Ọdịda a ha na-ada bụkwa ụgwọ ọrụ ha.
-