-
Luk 12:45, 46Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
45 Ma, ọ bụrụ na ohu ahụ ekwuo n’obi ya, sị: ‘Nna m ukwu na-egbu oge ịbịa,’ wee malite iti ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi ihe, na-eri, na-aṅụ, mmanya ana-egbukwa ya,+ 46 nna ukwu nke ohu ahụ ga-abịa n’ụbọchị ọ na-atụghị anya ya nakwa n’oge ọ na-amaghị. Ọ ga-atakwa ya ezigbo ahụhụ ma kpọga ya n’ebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nọ.
-