-
Matiu 18:8, 9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
8 N’ihi ya, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* gbupụ ya tụfuo.+ Ọ kaara gị mma ibu nkwarụ ma ọ bụ inwe otu ụkwụ nweta ndụ kama inwe aka abụọ ma ọ bụ ụkwụ abụọ, a tụba gị n’ọkụ ebighị ebi.*+ 9 Ọ bụrụkwa na anya gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* ghụpụ ya tụfuo. Ọ kaara gị mma ibu otu anya nweta ndụ kama inwe anya abụọ a tụba gị na Gehena* bụ́ ebe ọkụ na-ere.+
-