-
Mak 9:43-48Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
43 “Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* gbupụ ya. Ọ kaara gị mma ibu nkwarụ nweta ndụ kama inwe aka abụọ banye na Gehena,* n’ọkụ nke a na-enweghị ike imenyụ emenyụ.+ 44* —— 45 Ọ bụrụkwa na ụkwụ gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* gbupụ ya. Ọ kaara gị mma inwe otu ụkwụ nweta ndụ kama inwe ụkwụ abụọ a tụba gị na Gehena.*+ 46* —— 47 Ọ bụrụkwa na anya gị na-eme ka ị na-eme mmehie,* ghụpụ ya.+ Ọ kaara gị mma ibu otu anya banye n’Alaeze Chineke kama inwe anya abụọ a tụba gị na Gehena.*+ 48 Ikpuru ndị dị n’ebe ahụ anaghị anwụ anwụ, a naghịkwa emenyụ ọkụ ya emenyụ.+
-