-
Luk 22:67-71Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
67 “Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị.”+ Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụrụgodị na mụ agwa unu, unu agaghị ekwe. 68 Ọ bụrụkwa na mụ ajụọ unu ajụjụ, unu agaghị aza. 69 Ma, si ugbu a gawa, Nwa nke mmadụ+ ga-anọdụ ala n’aka nri Chineke dị ike.”+ 70 Ha niile wee sị: “Ị̀ na-ekwu na ị bụ Ọkpara Chineke?” O wee sị ha: “Ọ bụ unu kwuru na m bụ.”* 71 Ha wee sị: “Ọ̀ ka bara uru ịchọwa ndị akaebe ọzọ, n’ihi na anyị anụla ya n’ọnụ ya?”+
-