64 Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.* Ma ana m asị unu: Si ugbu a gawa, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri Chineke dị ike*+ ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+
32 Chineke kpọlitere Jizọs a n’ọnwụ, anyị hụkwara ya.+33 A kpọgoro ya n’eluigwe, ya anọrọ n’aka nri Chineke.+ Nna ya nyekwara ya mmụọ nsọ o kwere nkwa na ọ ga-ezite.+ Ọ bụ ya mere o ji wụkwasị anyị mmụọ nsọ dị ka unu na-ahụ ma na-anụ.
34 Ònye ga-ama ha ikpe? E nweghị, n’ihi na ọ bụ Kraịst Jizọs bụ onye ahụ nwụrụnụ. Ọ bụghị naanị na ọ nwụrụ, kama a kpọlitekwara ya. Ọ nọ n’aka nri Chineke,+ ọ na-arịọkwara anyị arịrịọ.+
3 Ọ bụ onyinyo ebube Chineke.+ O yikwara nnọọ Chineke,+ ọ na-ejikwa okwu ya dị ike eme ka ihe niile na-adị. Mgbe ọ sachapụchara mmehie anyị,+ ọ nọdụrụ ala n’aka nri Onye Ukwu ahụ, n’ebe dị elu.+