17 N’ihi na Herọd zipụrụ ndị mmadụ, ha agaa jide Jọn, kee ya agbụ ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya, onye ọ lụrụ.+18 N’ihi na Jọn nọ na-agwa Herọd, sị: “Ọ dịghị mma na ị kpọọrọ nwunye nwanne gị nwoke lụwa.”+
19 Ma Jọn gwara Herọd onye na-achị Galili gbasara ihe ọjọọ niile ọ na-eme, gwakwa ya na ọ dịghị mma na ọ kpọọrọ Herodias nwunye nwanne ya. 20 N’ihi ya, Herọd mekwuru ihe ọjọọ ọzọ: Ọ kpọchiri Jọn n’ụlọ mkpọrọ.+