-
Mak 6:17-20Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
17 N’ihi na Herọd zipụrụ ndị mmadụ, ha agaa jide Jọn, kee ya agbụ ma tụba ya n’ụlọ mkpọrọ n’ihi Herodias nwunye Filip nwanne ya, onye ọ lụrụ.+ 18 N’ihi na Jọn nọ na-agwa Herọd, sị: “Ọ dịghị mma na ị kpọọrọ nwunye nwanne gị nwoke lụwa.”+ 19 N’ihi ya, Herodias buuru Jọn iwe n’obi, chọọkwa igbu ya. Ma, o nweghị ike igbu ya 20 n’ihi na Herọd na-atụ Jọn egwu maka na ọ ma na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ,+ ọ nọkwa na-echebe ya. Mgbe ọ bụla ọ nụrụ ihe Jọn kwuru, ọ naghị ama ihe ọ ga-eme. Ma, ọ na-eji obi ụtọ ege ya ntị.
-