-
Luk 8:35-37Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
35 Ma ndị mmadụ pụtara ka ha hụ ihe merenụ. Ha wee bịakwute Jizọs ma hụ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ si n’ime ya pụta ka o yi uwe, nọrọ ọdụ n’akụkụ ụkwụ Jizọs, isi kpakọkwara ya ọnụ. Egwu wee tụọ ha. 36 Ndị hụrụ otú ihe ahụ si mee kọọrọ ndị ahụ bịaranụ otú e si mee ka ahụ́ dị nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji mma. 37 Ọtụtụ ndị si obodo ndị gbara Geresa gburugburu gwara Jizọs ka o si ebe ha nọ pụọ, n’ihi na ezigbo ụjọ ji ha. O wee banye n’ụgbọ mmiri ka ọ pụọ.
-