-
Luk 8:45-48Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
45 Jizọs wee sị: “Ònye bitụrụ m aka?” Mgbe ha niile nọ na-agọ agọ, Pita sịrị: “Onye Ozizi, ìgwè mmadụ gbara gị gburugburu ma na-adagide gị.”+ 46 Ma Jizọs sịrị: “O nwere onye bitụrụ m aka, n’ihi na ama m na ike+ pụrụ m n’ahụ́.” 47 Mgbe nwaanyị ahụ hụrụ na Jizọs amatala ihe o mere, ọ maara jijiji bịa sekpuru ala n’ihu ya, kwuokwa n’ihu mmadụ niile ihe mere o ji bitụ ya aka na otú e si gwọọ ya ozugbo. 48 Ma ọ sịrị ya: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emeela ka ahụ́ dị gị mma. Lawa n’udo.”+
-