8Mgbe o si n’ugwu ahụ rịdata, oké ìgwè mmadụ sooro ya. 2 Ma, otu onye ekpenta bịara kpọọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+
12 N’oge ọzọ, ka Jizọs nọ n’otu n’ime obodo ndị ahụ, otu nwoke ekpenta zuru ahụ́ hụrụ ya, gbuo ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, rịọ ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ị chọrọ, ị ga-emeli ka m dị ọcha.”+