-
Luk 21:29-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 O mekwaara ha otu ihe atụ, sị: “Leruonụ osisi fig na osisi ọzọ niile anya.+ 30 Mgbe ha mara ifuru, unu na-ahụ ya, mara na oge osisi ji amị mkpụrụ dị nso. 31 Ma ununwa, mgbe unu hụrụ ka ihe ndị a na-eme, maranụ na Alaeze Chineke dị nso. 32 N’eziokwu, ana m asị unu na e nweghị ihe ga-eme ka ọgbọ a nwụchaa ruo mgbe ihe ndị a niile mere.+ 33 Eluigwe na ụwa ga-ala n’iyi.* Ma, e nweghị ihe ga-eme ka okwu m laa n’iyi.*+
-