23 N’ihi na ọ bụ ihe Onyenwe anyị kụziiri m ka m na-akụziri unu. N’abalị ahụ+ a ga-arara Onyenwe anyị Jizọs nye n’aka ndị iro ya, o weere otu ogbe achịcha. 24 Mgbe o kelechara Chineke, ọ nyawara ya, sị: “Nke a pụtara ahụ́ m,+ nke m ga-enye n’ihi unu. Na-emenụ nke a iji na-echeta m.”+