5Ebe mụnwa bụkwa okenye, na-agbakwa àmà gbasara ahụhụ Kraịst tara, sorokwa ná ndị a ga-eme ka a hụ na ha dị ebube,+ ana m agba ndị bụ́ okenye n’ime unu ume, sị:
16 Ihe anyị gwara unu gbasara ike Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na ọnụnọ ya abụghị akụkọ ụgha ndị mmadụ chepụtara iji duhie ibe ha, kama ọ bụ ihe anyị ji anya anyị hụ gbasara ebube ya.+