3 “Lee, m na-ezite onye ozi m, ọ ga-edozikwa ụzọ n’ihu m.+ Na mberede, ezigbo Onyenwe unu, onye unu na-achọ, ga-abịa n’ụlọ nsọ ya;+ onye ozi nke ọgbụgba ndụ ga-abịakwa, onye unu na-atụsi anya ya ike. Lee, ọ ga-abịa.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.