21 Ọ ga-amụ nwa nwoke, ị ga-agụkwa ya Jizọs,+ n’ihi na ọ ga-azọpụta ndị ya ná mmehie ha.”+ 22 Ihe a niile mere ka ihe Jehova si n’ọnụ onye amụma ya kwuo mezuo. Ọ sịrị: 23 “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ga-adị ime, mụọ nwa nwoke. A ga-agụ ya Ịmanuel,”+ nke pụtara “Chineke Nọnyeere Anyị.”+