41 Ma, otu nwoke aha ya bụ Jaịrọs bịara. Nwoke a bụ onyeisi oche ụlọ nzukọ. O wee gbuo ikpere n’ala n’ihu Jizọs, malite ịrịọsi ya ike ka ọ bịa n’ụlọ ya,+ 42 n’ihi na otu nwa nwaanyị ọ mụrụ naanị ya, onye dị ihe dị ka afọ iri na abụọ, nọ n’ọnụ ọnwụ.
Ka Jizọs nọ na-aga, ìgwè mmadụ nọ na-adagide ya.