-
Ọnụ Ọgụgụ 6:2, 3Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
2 “Gwa ndị Izrel okwu, sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ekwe nkwa pụrụ iche na ọ ga-abụ onye Naziraịt*+ nke Jehova, 3 ọ gaghị na-aṅụ mmanya na ihe ọ bụla na-aba n’anya. Ọ gaghị aṅụ mmanya gbara ụka ma ọ bụ ihe na-aba n’anya gbara ụka.+ Ọ gaghị aṅụ ihe ọ bụla a na-aṅụ aṅụ e ji mkpụrụ vaịn mee. Ọ gaghịkwa ata mkpụrụ vaịn, ma nke ndụ ma nke a mịkpọrọ amịkpọ.
-