12 Ka o rutere nso n’ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ, e nwere onye nwụrụ anwụ a na-ebupụ. Ọ bụ nwa nwoke nne ya mụrụ naanị ya.+ Nne ya bụkwa nwaanyị isi mkpe. Ọtụtụ ndị obodo ahụ sokwa ya. 13 Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o meteere ya ebere,+ wee sị ya: “Ebezila.”+