-
Matiu 23:27, 28Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 “Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu bụ ndị ihu abụọ.+ Unu ga-ata ahụhụ n’ihi na unu yiri ili e tere nzu,+ nke na-eyi ihe mara mma n’elu ma ime ya ejupụta n’ọkpụkpụ ndị nwụrụ anwụ nakwa n’ụdị adịghị ọcha ọ bụla. 28 Otú ahụkwa ka unu na-eyi ndị ezi omume n’anya ndị mmadụ, ma ihe juru n’ime unu bụ ihu abụọ na mmebi iwu.+
-