-
Abụ Ọma 49:16-19Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
16 Egwu atụla gị maka na mmadụ bara ọgaranya,
Maka na ọ na-akpatakwu akụ̀ n’ụlọ ya.
17 N’ihi na e nweghị otu mkpụrụ ihe ọ ga-ewere ma ọ nwụọ.+
Akụnụba ya agaghị eso ya banye n’ili.+
18 Ọ na-aja onwe ya* ike n’oge ọ nọ ndụ.+
(Ndị mmadụ na-eto mmadụ mgbe ihe na-agaziri ya.)+
19 Ma n’ikpeazụ, ọ na-anwụ otú nna nna ya hà nwụrụ.
Ha agaghịzi ahụ ìhè ọzọ.
-