20 Kama, na-akpakọtaranụ onwe unu akụ̀ n’eluigwe,+ ebe ọ na-agaghị ata nchara, egu agaghịkwa eri ya,+ ebe ndị ohi na-anaghịkwa abanye zuo ohi. 21 N’ihi na n’ebe akụ̀ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.
9 “Ana m asịkwa unu: Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi,+ ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ ahụ na-adịkwaghị, ha anabata unu n’ebe unu ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.+
18 Gwakwa ha ka ha na-eme ihe ọma, na-arụ ọtụtụ ọrụ ọma, na-emesapụ aka, na-enyekwa ndị ọzọ ihe.+19 Ha ga-esi otú ahụ na-akpakọta akụ̀ n’ebe Chineke nọ, na-atọkwa ezigbo ntọala maka ọdịnihu,+ ka ha nwee ike ijidesi ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ aka ike.+