-
Matiu 21:33-41Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
33 “Nụrụnụ ihe atụ ọzọ: E nwere otu nwoke nwere ala, kọọ ubi vaịn na ya,+ gbaakwa ya ogige ma gwuo ebe a na-azọchapụta mmanya na ya, rụọkwa ụlọ elu na ya.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gaa mba ọzọ.+ 34 Mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o ziri ndị ohu ya ka ha gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ weta mkpụrụ ya. 35 Ma, ndị ọrụ ubi ahụ jidere ndị ohu ya, tikasịa otu ahụ́, gbuo onye nke ọzọ, tụọkwa onye nke ọzọ nkume.+ 36 O zikwara ndị ohu ọzọ, ndị dị ọtụtụ karịa ndị nke mbụ, ka ha gakwuru ha. Ma, ha mere ha otu ihe ahụ.+ 37 N’ikpeazụ, o zigaara ha ọkpara ya, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ 38 Mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ọkpara ya, ha gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 39 Ha wee jide ya, kpọpụ ya n’ubi vaịn ahụ, gbuo ya.+ 40 N’ihi ya, mgbe onye nwe ubi vaịn ahụ bịara, gịnị ka ọ ga-eme ndị ọrụ ubi ahụ?” 41 Ha asị ya: “Ebe ọ bụ na ha bụ ndị ọjọọ, ọ ga-abịa laa ha n’iyi, nyefeekwa ubi vaịn ahụ n’aka ndị ọrụ ubi ọzọ, ndị ga-enye ya mkpụrụ ya mgbe oge ya ruru.”
-
-
Mak 12:1-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 Jizọs malitere imere ha ihe atụ. Ọ sịrị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn,+ gbaa ya ogige gburugburu, gwuo olulu ebe mmanya si n’ebe a na-azọchapụta mmanya ga na-asọba ma rụọ ụlọ elu.+ O nyefeziri ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gawa mba ọzọ.+ 2 Mgbe oge e ji aghọ mkpụrụ vaịn ruru, o zipụrụ otu ohu ya ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ nata ha ụfọdụ n’ime mkpụrụ si n’ubi vaịn ahụ. 3 Ma ha jidere ya, tikasịa ya ahụ́ ma chụlaa ya n’enyeghị ya ihe ọ bụla. 4 O zigakwaara ha ohu ọzọ. Ma ha kụrụ ya ihe n’isi, menyekwa ya ihere.+ 5 O wee ziga onye ọzọ, ha egbuo ya. O zigakwara ọtụtụ ndị ọzọ. Ma ha tiri ụfọdụ n’ime ha ihe, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha. 6 O wee zigara ha onye nke ikpeazụ o nwere, bụ́ ọkpara ya ọ hụrụ n’anya,+ kwuo, sị, ‘Ha ga-akwanyere ọkpara m ùgwù.’ 7 Ma ndị ọrụ ubi ahụ gwara ibe ha, sị, ‘Ọ bụ onye a ga-eketa ubi a.+ Bịanụ ka anyị gbuo ya, ka ihe ọ ga-eketa bụrụzie nke anyị.’ 8 Ha wee jide ya, gbuo ya ma tụpụ ya n’ubi vaịn ahụ.+ 9 Gịnịzi ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme? Ọ ga-abịa gbuo ndị ọrụ ubi ahụ ma nyefee ndị ọzọ ubi vaịn ahụ.+
-