3 Ọ bụghị naanị ya, kama ka anyị na-aṅụrị ọṅụ* mgbe a na-akpagbu anyị,+ ebe ọ bụ na anyị ma na mkpagbu na-eme ka anyị tachie obi;+4 ịtachi obi na-eme ka anyị na Chineke dịrị ná mma;+ anyị na Chineke ịdị ná mma na-eme ka anyị nwee olileanya.+
5 N’ihi ya, na-agbasinụ mbọ ike+ ka unu nwee okwukwe, na-akpakwa àgwà ọma.+ Na-agbasikwanụ mbọ ike ka unu mara ihe,+6 na-ejide onwe unu,+ na-atachi obi, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.+