30 Mgbe ahụ, ihe àmà Nwa nke mmadụ ga-apụta n’eluigwe, ebo niile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ruo uju.+ Ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ+ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu.+
7 Ọ ga-abịa n’ígwé ojii.+ Anya niile ga-ahụ ya. Ndị mara ya ube ga-ahụkwa ya. Ebo niile nke ụwa ga-eti aka n’obi, ruokwa uju n’ihi ya.+ N’eziokwu, ihe a ga-emerịrị. Amen.