2 N’ihi na unu ma nke ọma na ụbọchị Jehova+ ga-abịa nnọọ otú onye ohi si abịa n’abalị.+ 3 Mgbe ọ bụla ha na-asị, “Udo adịla, obi eruokwala anyị ala!” a ga-ebibi ha na mberede mgbe ha na-atụghị anya ya,+ otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede. Ha agaghị agbanahụ ya.