27 Ha kpọtara ha, ha eguzoro n’ihu ndị zukọrọ na Sanhedrin. Nnukwu onye nchụàjà wee gwa ha, 28 sị: “Anyị gwasiri unu ike ka unu kwụsị ịkụziri ndị mmadụ ihe n’aha a.+ Ma unu emeela ka ihe unu na-akụzi gbasaa ebe niile na Jeruselem. Unu chọkwara ka ọbara nwoke a dị anyị n’isi.”+