-
Matiu 14:24-33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
24 Ka ọ dịgodị, ụgbọ mmiri ahụ esila n’akụkụ osimiri ahụ gaa ọtụtụ narị mita,* ebili mmiri mekwara ka o sie ike ịkwọ ya, n’ihi na ifufe na-efesi ike. 25 Ma n’oge nche nke anọ nke abalị,* o jeere ije n’elu oké osimiri ahụ na-abịakwute ha. 26 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-eje ije n’elu oké osimiri ahụ, obi mapụrụ ha, ha asị: “Ọ bụ mmụọ!” Ha wee tie mkpu n’ihi egwu ha na-atụ. 27 Ma, Jizọs gwara ha ozugbo, sị: “Nweenụ obi ike. Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”+ 28 Pita gwara ya, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, gwa m ka m bịakwute gị n’elu mmiri.” 29 O wee sị: “Bịa.” Pita esizie n’ụgbọ ahụ pụta, jere ije n’elu mmiri ahụ gakwuruwe Jizọs. 30 Ma mgbe ọ hụrụ oké ifufe ahụ, egwu tụrụ ya. Mgbe ọ malitekwara imikpu, o tiri mkpu, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta m!” 31 Jizọs matịrị aka ozugbo, jide ya wee sị ya: “Onye okwukwe nta, gịnị mere i ji nwewe obi abụọ?”+ 32 Mgbe ha banyere n’ụgbọ ahụ, oké ifufe ahụ kwụsịrị. 33 N’ihi ya, ndị nọ n’ụgbọ ahụ kpọọrọ ya isiala, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke n’eziokwu.”
-