14 Mgbe ndị mmadụ hụrụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ,* ha malitere ịsị: “N’eziokwu, onye a bụ Onye Amụma ahụ ga-abịa n’ụwa.”+15 Ma, ebe Jizọs ma na ha na-achọ ịbịa jide ya ka ha mee ya eze, ọ gaghachiri+ n’ugwu naanị ya.+
37 N’ụbọchị ikpeazụ, nke bụ́ nnukwu ụbọchị n’ememme ahụ,+ Jizọs guzoro ọtọ ma jiri oké olu kwuo, sị: “Ọ bụrụ na mmiri na-agụ onye ọ bụla, ya bịakwute m ṅụọ mmiri.+