19 Ma, ha kpụta unu n’ihu ha, unu echegbula onwe unu banyere otú unu ga-esi ekwu okwu ma ọ bụ ihe unu ga-ekwu, n’ihi na a ga-agwa unu ihe unu ga-ekwu n’oge ahụ.+20 N’ihi na ọ bụghị ununwa na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.+
13 Ma, mgbe ihe inyeaka ahụ ga-abịa, bụ́ mmụọ nke eziokwu,+ ọ ga-edu unu ka unu ghọta eziokwu niile, n’ihi na ọ gaghị ekwu ihe bụ́ uche ya. Kama ihe ndị ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akọkwara unu ihe ndị ka ga-emenụ.+
27 Ma ununwa, mmụọ nsọ o ji tee unu mmanụ+ ka dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe. Ma mmụọ ahụ o ji tee unu mmanụ na-akụziri unu ihe niile,+ ọ bụkwa eziokwu, ọ bụghị ụgha. Unu na ya dịrị n’otu+ otú mmụọ ahụ kụziiri unu.