-
Emọs 5:25-27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
25 Ndị Izrel, ò nwere mgbe unu chụụrụ m àjà
Ma ọ bụ nye m onyinye n’afọ iri anọ unu nọrọ n’ala ịkpa?+
26 Ugbu a, unu ga-eburu Sakọt bụ́ eze unu pụọ, burukwa Kaịwan.*
Ihe ndị a bụ arụsị ndị unu mere, bụrụkwa chi kpakpando, ndị unu meere onwe unu.
27 M ga-emekwa ka a dọrọ unu n’agha gaa n’ebe dị anya karịa Damaskọs.’+ Onye aha ya bụ Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha,+ kwuru ihe a.”
-