19 N’ihi ya, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.+ Na-eme ha baptizim+ n’aha Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. 20 Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.+ M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.”*+
8 Ma unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.+ Unu ga-abụkwa ndị àmà m+ ma na Jeruselem+ ma na Judia na Sameria niile,+ ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.”*+