23 N’oge ahụ, e nwere otu nwoke mmụọ ọjọọ* ji nọ n’ụlọ nzukọ ha. O tiri mkpu, sị: 24 “Jizọs onye Nazaret, gịnị jikọrọ anyị na gị?+ Ị̀ bịara ibibi anyị? Ama m gị nke ọma, Onye Nsọ nke Chineke.”+
41 Ndị mmụọ ọjọọ sikwa n’ime ọtụtụ mmadụ pụta, na-eti mkpu, sị: “Ị bụ Ọkpara Chineke.”+ Ma, ọ na-abara ha mba. Ọ naghịkwa ekwe ka ha kwuo okwu,+ n’ihi na ha ma na ọ bụ ya bụ Kraịst.+