15 Ma Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Gawa, n’ihi na ahọrọla m nwoke a+ ka ọ gbaara ndị mba ọzọ,+ ndị eze+ nakwa ndị Izrel àmà gbasara m. 16 M ga-eme ka ọ mara ahụhụ niile ọ ga-ata n’ihi aha m.”+
4 Anyị chọwara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ wee chọta ha ma nọrọ ebe ahụ ruo ụbọchị asaa. Ma n’ihi ihe mmụọ nsọ mere ka ụfọdụ ụmụnna mara, ha gwara Pọl ugboro ugboro ka ọ ghara ịkpa ụkwụ na Jeruselem.+
11 Ọ bịakwutere anyị ma chịrị ájị̀* Pọl, jiri ya kee onwe ya agbụ ụkwụ na aka, sị: “Chineke ji mmụọ nsọ kwuo, sị: ‘Otú a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ájị̀ a agbụ na Jeruselem+ ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’”+