11 Gbalịanụ ka unu na-ebi n’udo,+ ghara ịna-etinye anya n’ihe na-agbasaghị unu,+ kama na-arụnụ ọrụ.+ Ọ bụ ihe anyị kụziiri unu. 12 Ime otú a ga-eme ka ndị nọ n’èzí hụ na unu na-ebi ndụ dị mma,+ a gharakwa inwe ihe na-akpa unu.
7 N’ihi na unu ma otú unu ga-esi na-eme ka* anyị,+ n’ihi na anyị akpaghị àgwà na-adịghị mma mgbe anyị na unu nọ, 8 anyị erighịkwa nri onye ọ bụla n’efu.*+ Kama anyị gbara ezigbo mbọ ma rụsie ọrụ ike ehihie na abalị ka anyị ghara ibo onye ọ bụla n’ime unu ibu dị arọ.+