-
Ndị Efesọs 1:13, 14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 Ma unu kwekwaara na Kraịst mgbe unu nụrụ eziokwu ahụ, ya bụ, ozi ọma gbasara otú Chineke ga-esi zọpụta unu. Mgbe unu kweere na ya, Chineke si n’aka ya jiri mmụọ nsọ o kwere ná nkwa kaa unu akara.+ 14 Mmụọ nsọ a bụ ihe na-eme ka obi sie anyị ike na anyị ga-eketa ihe Chineke kwere anyị ná nkwa.+ Chineke mere ihe a iji gbapụta+ ndị ya,+ nke ga-eme ka a na-aja ya mma, na-etokwa ya.
-