31 Jizọs wee gwa ndị Juu kweere na ya, sị: “Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m kwuru mgbe niile, unu bụ ndị na-eso ụzọ m n’eziokwu. 32 Unu ga-amara eziokwu,+ eziokwu ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”+
25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+