20 N’ihi ya, e nweghị onye* a ga-akpọ onye ezi omume n’ihu ya maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu,+ n’ihi na ọ bụ iwu na-eme ka anyị mata ihe bụ́ mmehie.+
11 Ọ bụrụ na ọrụ nchụàjà ndị Livaị na-arụ ga-emeli ka mmadụ zuo okè+ (n’ihi na ọrụ a so n’Iwu ahụ* e nyere ha), ọ̀ ka ga-adị mkpa ka e nwee onye nchụàjà ọzọ, onye e kwuru na ọ dị ka Melkizedek,+ ọ bụghị ka Erọn?