-
Ndị Rom 15:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 N’ihi na obi dị ndị nọ na Masedonia na Akeya ụtọ isi n’ihe ndị ha nwere tụkọta ihe a ga-enye ndị dara ogbenye n’ime ndị nsọ nọ na Jeruselem.+ 27 N’eziokwu, obi dị ha ụtọ ime otú ahụ. Ha jidị ha ụgwọ ime ya. N’ihi na ọ bụrụ na mba dị iche iche ritere uru n’ihe Chineke nyere ndị nsọ ahụ, ha jikwa ụgwọ iji ihe ndị ha nwere jeere ndị nsọ ozi.+
-
-
Ndị Filipaị 4:15-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
15 N’eziokwu, unu ndị Filipaị makwa na mgbe mbụ unu nụrụ ozi ọma, mgbe m hapụkwara Masedonia gawa ebe ọzọ, e nweghị ọgbakọ ọ bụla nyeere m aka ma ọ bụ kwe ka m nyere ha aka, ma e wepụ naanị unu.+ 16 N’ihi na, mgbe m nọ na Tesalonaịka, unu ziteere m ihe, ọ bụghị naanị otu ugboro kama ugboro abụọ, ka m jiri gboo mkpa m. 17 Ọ bụghị na m na-achọ ka e nye m onyinye, kama m na-achọ ka unu na-arụ ọrụ ọma ndị ga-abakwuru unu uru.
-