Ndị Galeshia 2:7 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 7 Ma, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izi ndị a na-ebighị úgwù ozi ọma,+ otú e nyere Pita ọrụ izi ndị e biri úgwù ozi ọma, Ndị Efesọs 3:1, 2 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 3 Ihe mere e ji tụọ mụnwa, bụ́ Pọl, mkpọrọ+ bụ n’ihi na m na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-enyekwara ununwa bụ́ ndị mba ọzọ aka. 2 N’eziokwu, ama m na unu anụla na e nyere m ọrụ inyere unu aka+ ka amara Chineke baara unu uru. Ndị Kọlọsi 1:25 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 25 M na-ejere ndị Chineke ozi n’ihi na ọ họpụtara m maka ozi a.+ Ọ bụkwa maka ọdịmma unu. Ọ bụ ya mere m ji na-eji ike m niile ekwusa okwu Chineke.
7 Ma, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izi ndị a na-ebighị úgwù ozi ọma,+ otú e nyere Pita ọrụ izi ndị e biri úgwù ozi ọma,
3 Ihe mere e ji tụọ mụnwa, bụ́ Pọl, mkpọrọ+ bụ n’ihi na m na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-enyekwara ununwa bụ́ ndị mba ọzọ aka. 2 N’eziokwu, ama m na unu anụla na e nyere m ọrụ inyere unu aka+ ka amara Chineke baara unu uru.
25 M na-ejere ndị Chineke ozi n’ihi na ọ họpụtara m maka ozi a.+ Ọ bụkwa maka ọdịmma unu. Ọ bụ ya mere m ji na-eji ike m niile ekwusa okwu Chineke.