6 Ma otu onye gbara àmà n’otu ebe, sị: “Gịnị ka mmadụ bụ nke mere i ji na-echeta ya? Ma ọ bụ, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ nke mere i ji na-elekọta ya?+ 7 I mere ka ndị mmụọ ozi katụ ya. I ji ebube na nsọpụrụ chọọ ya mma, meekwa ka o lekọtawa ọrụ aka gị.